Psalms 116

Chineke na-anapụta

1Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m;
ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere.
2Nʼihi na o gere m ntị,
aga m akpọku ya oge ndụ m niile.

3Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m,
oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m;
nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m.
4Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị:
“O Onyenwe anyị, zọpụta m!”

5 Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume.
Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko.
6 Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche;
mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m.

7Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m,
nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.

8Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ,
anya m site na anya mmiri akwa,
napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,
9ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị
nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.

10Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị,
“Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,”
11nʼime ịda mba m, ekwuru m sị,
“Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”

12Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị
nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m?

13Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu
kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
14Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ
mezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị.

15Ọnwụ nke ndị nsọ ya
dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị.
16O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị;
abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị;
ị zọpụtala m site na agbụ e kere m.

17Aga m achụrụ gị aja ekele
kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
18Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile
ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,
19nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị,
nʼetiti gị, O Jerusalem.

Toonu Onyenwe anyị.
Copyright information for IboBIU